Song of Solomon 2

Onye a hụrụ nʼanya

1Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,
Okoko osisi a bụ otu nʼime okoko osisi ndị na-epu nʼọkọchị, na ndịda akụkụ osimiri Kamel Aịz 35:1-2

na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.
Onye hụrụ ibe ya nʼanya

2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,
otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.
Onye a hụrụ nʼanya

3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,
mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.
Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,
mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.
4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,
ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.
5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;
werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,
nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.
6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,
aka nri ya na-ejikụ m.
7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:
Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,
ruo mgbe ọ masịrị ya.

8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!
Lee ya ka ọ na-abịa,
na-amali elu nʼelu ugwu niile,
na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.
9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.
Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,
ọ na-esikwa na oghereikuku
na nʼoghere dị ya na-elebata anya.
10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,
“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,
onye m mara mma, soro m.
11Lee, oge oyi agafeela,
udu mmiri agabigakwala.
12Okoko osisi epupụtala nʼala;
oge eji agụ egwu eruokwala,
a na-anụ abụ nduru
nʼala anyị niile.
13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,
Osisi fiig na-amị mkpụrụ ugboro abụọ nʼafọ nʼIzrel. Ọ bụ nʼoge ọkọchị ka ọ kachasị amị mkpụrụ, amaokwu a na-ekwu banyere owuwe ihe ubi nke mkpụrụ fiig mbụ.

isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”
Onye hụrụ ibe ya nʼanya

14Nduru m nọ nʼọgba nkume,
nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,
gosi m ihu gị,
mee ka m nụ olu gị,
nʼihi na olu gị dị ụtọ,
ihu gị makwara mma.
15Jidenụ nkịta ọhịa,
ụmụ nkịta ọhịa niile
na-emebiri anyị ubi,
ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.
Onye a hụrụ nʼanya

16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,
17tutu chi ụtụtụ abọọ
mgbe onyinyo niile na-agabigakwa.
Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya,
dị ka mgbada
maọbụ nwa ele
nke nọ nʼelu ugwu.
Copyright information for IboBIU